Job 34

1Mgbe ahụ Elihu sịrị:

2“Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe;
gee m ntị unu ndị ikom nwere mmụta.
3Ntị na-anwale okwu dịka
ire si anụ ụtọ ihe oriri.
4Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi;
ka anyị nọkọta mụta ihe dị mma.

5“Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume,
ma Chineke na-anapụ m ikpe ziri ezi.
6Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha
ma a na-ahụta m dịka onye ụgha;
ọ bụ eziokwu na ikpe amaghị m
ma ọnya na-enweghị ngwọta ka àkụ ya na-enye m.’
7Olee nwoke dịka Job,
nke na-aṅụ ịkwa emo dịka mmiri?
8Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi,
ya na ndị ajọ omume na-emekọkwa ihe.
9Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya
na mmadụ na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.’ a

10“Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta.
Ya bụrụ ihe dị anya nʼebe Chineke nọ, bụ ime ajọ omume,
bụrụkwa ihe dị anya nʼebe Onye pụrụ ime ihe niile nọ, bụ ime ihe na-ezighị ezi.
11Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị,
ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.
12Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi,
na Onye pụrụ ime ihe niile ga-ekpe ikpe nʼezighị ezi.
13Onye họpụtara ya ịchị ụwa?
Onye mere ya onye nlekọta ụwa niile?
14Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya
iweghachi mmụọ ya na nkuume ya,
15mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi,
mmadụ niile ga-alaghachikwa nʼaja.

16“Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a;
gee ntị nʼokwu m.
17Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị?
Ị ga-ama Onye ezi omume na onye dị ike ikpe?
18Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’
ma na-agwakwa ndị a mara aha ha sị, ‘Unu bụ ndị ajọ omume.’
19Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze,
onye na-adịghị emenyere ndị ọgaranya, ma megbuo ndị ogbenye,
nʼihi na ha niile bụ ọrụ aka ya.
20Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị;
ndị ahụ na-ama jijiji ma gabiga;
a na-ewezugakwa ndị dị ike ma ọ bụghị site nʼaka mmadụ.

21“Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ;
ọ na-ahụkwa nzọ ụkwụ ha niile.
22Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị,
ebe ndị na-eme ajọ ihe pụrụ izo.
23Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ,
nke mere na ha ga-abịa nʼihu ya maka ikpe ikpe.
24Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha
ma were ndị ọzọ dochie nʼọnọdụ ha.
25Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile,
ọ na-achụpụ ha nʼabalị mee ka ha ghọọ ndị e gwepịara egwepịa.
26Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ
nʼihi ajọ omume ha,
27nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha,
ha enweghịkwa uche ilebanye anya nʼụzọ ya ọbụla.
28Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị,
nke mere na ọ nụrụ akwa ndị nọ na mkpa.
29Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe?
Ọ bụrụ na o zoo ihu ya, onye pụrụ ịhụ ya?
Ma ya onwe ya na-achị isi nʼebe mmadụ na mba nọ,
30igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo,
ka ọ gharakwa ịbụ ihe ọnya nye ndị mmadụ.

31“Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke,
‘Abụ m onye ikpe mara ma agaghị m emehie kwa ọzọ.
32Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị
Maọbụ, amaghị
ịhụ;
ọ bụrụ na m emehiela, agaghị m emekwa ya ọzọ.’
33Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi
Ya bụ, nrọpụta
gị
mgbe ị jụrụ ichegharị?
Gị onwe gị ga-ekpebi, ọ bụghị mụ;
ya mere gwa m ihe ị mara.

34“Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si,
ndị amamihe nụrụ okwu m na-asị m,
35‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe;
okwu ya dị ka nke onye na-enweghị uche.’
36Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ
maka ọsịsa ya dịka nke ajọ mmadụ!
37Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya;
na-akụ aka nʼetiti anyị nʼụzọ ịkwa emo,
ma werekwa okwu nkwulu bara ụba megide Chineke.”
Copyright information for IboBIU